Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 14:15
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jọn 14:15
“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile.
N’ọnọdụ ya
12Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m.
13Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.
14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.
15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile.
16Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.
17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu.
18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
N’asụsụ Bekee
Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile. Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.” Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?” Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri. Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu.Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya. Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya.Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike