Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 1:10

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Galeshịa 1:10

Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 1

N’ọnọdụ ya

7nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst.

8A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.

9Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.

10Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.

11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya.

12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.

13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya.

Ndị Galeshịa 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleGalatians 1:10Am I now seeking the approval of men, or of God? Or am I striving to please men? If I were still trying to please men, I would not be a servant of Christ.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Te 2:4Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị.
Ọrụ 5:29Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ.
Efe 6:6Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha.
Jem 4:4Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
Mat 22:16Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ.
Kọl 3:22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.
2Kọ 5:9–11Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ. Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ. Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu.
Rom 2:29Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike