Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Luk 12:15
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Luk 12:15
Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.”
N’ọnọdụ ya
12Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.”
13Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.”
14Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?”
15Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.”
16Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu.
17O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’
18“Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ.
N’asụsụ Bekee
And He said to them, “Watch out! Guard yourselves against every form of greed, for one’s life does not consist in the abundance of his possessions.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere. Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere. Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi. Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.“Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya? Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị.Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike