Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Timoti 2:15
Amaokwu Baịbụl · IGCB
2 Timoti 2:15
Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
N’ọnọdụ ya
12Ọ bụrụ na anyị anagide, anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, ọ ga-ajụkwa anyị.
13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.
14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi.
15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
16Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa.
17Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a.
18Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala.
N’asụsụ Bekee
Make every effort to present yourself approved to God, an unashamed workman who accurately handles the word of truth.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị.Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro.Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ.Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche. Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke. Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi. Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma. Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike