Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 7:1–5

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 7:1–5

1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.

2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.

3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?

4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.

5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 7

N’ọnọdụ ya

1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.

2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.

3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?

4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.

5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.

6“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.

7“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.

8Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.

Matiu 7

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 7:1–5“Do not judge, or you will be judged. For with the same judgment you pronounce, you will be judged; and with the measure you use, it will be measured to you. Why do you look at the speck in your brother’s eye, but fail to notice the beam in your own eye? How can you say to your brother, ‘Let me take the speck out of your eye,’ while there is still a beam in your own eye? You hypocrite! First take the beam out of your own eye, and then you will see clearly to remove the speck from your brother’s eye.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Luk 6:37“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.
Rom 2:1–2Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ. Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi.
Jem 4:11–12Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe. Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
Luk 6:41“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
Rom 14:10–13Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke. E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ” E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke. Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ.
1Kọ 4:3–5Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m maọbụ ihe a na-ekpe nʼụlọikpe nke mmadụ. Nʼezie, anaghị m ekpekwa onwe m ikpe. O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye ikpe na-amaghị. Ọ bụ Onyenwe anyị naanị ka ọ dịrị ikpe m ikpe. Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.
Jọn 8:7–9Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.” Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya.
Gal 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike