Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 18:15–17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 18:15–17

15“Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru.

16Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’

17Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 18

N’ọnọdụ ya

12“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?

13Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ọ ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ.

14Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi.

15“Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru.

16Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’

17Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ.

18“Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe.

19“Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.

20Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”

Matiu 18

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 18:15–17If your brother sins against you, go and confront him privately. If he listens to you, you have won your brother over. But if he will not listen, take one or two others along, so that ‘every matter may be established by the testimony of two or three witnesses.’ If he refuses to listen to them, tell it to the church. And if he refuses to listen even to the church, regard him as you would a pagan or a tax collector.

Ihe e hotara n’Agba Ochie

Dit 19:15Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Lev 19:17“ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
Gal 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
Luk 17:3–4Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
2Te 3:15Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna.
Kọl 3:13Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.
Jem 5:19–20Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ, chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.
2Kọ 13:1Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike