Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Tesalonaịka 5:18
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Ndị Tesalonaịka 5:18
Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Tesalonaịka 5
N’ọnọdụ ya
15Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.
16Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile.
17Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka.
18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
19Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ.
20Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya.
21Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.
N’asụsụ Bekee
Give thanks in every circumstance, for this is God’s will for you in Christ Jesus.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike