Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Kọlọsị 3:21

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Kọlọsị 3:21

Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Kọlọsị 3

N’ọnọdụ ya

18Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.

19Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.

21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.

22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.

23Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.

24Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.

Ndị Kọlọsị 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleColossians 3:21Fathers, do not provoke your children, so they will not become discouraged.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 4:1–4Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta. Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m. Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji, ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
Efe 6:4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike