Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Kọlọsị 3:19

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Kọlọsị 3:19

Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Kọlọsị 3

N’ọnọdụ ya

16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

17Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.

18Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.

19Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.

21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.

22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.

Ndị Kọlọsị 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleColossians 3:19Husbands, love your wives and do not be harsh with them.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 3:7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
Jen 2:23–24Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Efe 5:25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.
Efe 5:28–29Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.
Efe 5:33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike