Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Ndị Kọrint 11:14
Amaokwu Baịbụl · IGCB
2 Ndị Kọrint 11:14
Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.
Gụọ isi ahụ dum: 2 Ndị Kọrint 11
N’ọnọdụ ya
11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.
12Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.
13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.
14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.
15Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.
16Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme.
17Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche.
N’asụsụ Bekee
And no wonder, for Satan himself masquerades as an angel of light.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube.Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike