Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Kọlọsị 2:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Kọlọsị 2:8
Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru.
N’ọnọdụ ya
5Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst.
6Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, na-ebinụ ndụ unu nʼime ya.
7Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.
8Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru.
9Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ.
10Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị.
11Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri.
N’asụsụ Bekee
See to it that no one takes you captive through philosophy and empty deception, which are based on human tradition and the spiritual forces of the world rather than on Christ.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma,Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ.Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa?Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike