Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 4:10
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Pita 4:10
Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi.
N’ọnọdụ ya
7Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.
8Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.
9Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla.
10Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi.
11Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
12Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ.
13Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè.
N’asụsụ Bekee
As good stewards of the manifold grace of God, each of you should use whatever gift he has received to serve one another.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha. Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe. Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.Achọrọ m ka unu na-ele anyị anya dịka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị e nyefere ihe omimi Chineke nʼaka. Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesiri ka ndị na-elekọta ihe ọbụla bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu.Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha.O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike