Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 5:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Pita 5:8
Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
N’ọnọdụ ya
5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
6Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
8Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
9Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.
11Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
N’asụsụ Bekee
Be sober-minded and alert. Your adversary the devil prowls around like a roaring lion, seeking someone to devour.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.Enyela ekwensu ohere.Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi. Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke. Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị. Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike