Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 3:15

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Pita 3:15

Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Pita 3

N’ọnọdụ ya

12Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”

13Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe?

14Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”

15Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.

16Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.

17Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.

18Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.

1 Pita 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Peter 3:15But in your hearts sanctify Christ as Lord. Always be prepared to give a defense to everyone who asks you the reason for the hope that is in you. But respond with gentleness and respect,

Ihe e hotara n’Agba Ochie

Aịz 8:12–13“Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Kọl 4:6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
2Tm 2:25–26Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu. Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.
Luk 21:14–15Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.
1Pt 3:2mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.
Mat 10:18–20A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ. Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
Hib 6:1Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,
Abụ 119:46Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,
Taị 1:2nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike