Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 5:7

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Pita 5:7

Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Pita 5

N’ọnọdụ ya

4Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.

5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”

6Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.

7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.

8Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.

9Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.

10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.

1 Pita 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Peter 5:7Cast all your anxiety on Him, because He cares for you.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Abụ 55:22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
Fil 4:6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
Abụ 37:5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
Abụ 56:3–4Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
Mat 6:25–26“Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya? Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?
Mat 6:33–34Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
Hib 13:5–6Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.” Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
Abụ 34:15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike