Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 5:5
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Pita 5:5
Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
N’ọnọdụ ya
2na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi.
3Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
4Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.
5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
6Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
8Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
N’asụsụ Bekee
Young men, in the same way, submit yourselves to your elders. And all of you, clothe yourselves with humility toward one another, because, “God opposes the proud, but gives grace to the humble.”Ihe e hotara n’Agba Ochie
Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike