Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Pita 3:9

Amaokwu Baịbụl · IGCB

2 Pita 3:9

Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.

Gụọ isi ahụ dum: 2 Pita 3

N’ọnọdụ ya

6Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.

7Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.

8Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.

9Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.

10Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.

11Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,

12dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.

2 Pita 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible2 Peter 3:9The Lord is not slow in keeping His promise as some understand slowness, but is patient with you, not wanting anyone to perish but everyone to come to repentance.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Tm 2:4Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.
Rom 2:4Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa?
Hab 2:3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka.
Abụ 86:15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Aịz 30:18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Mkp 2:21Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko.
Luk 18:7–8Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
1Tm 1:16Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike