Bible Explorer

Nyochaa › Oziọma nʼakụkụ ibe ha › Ahụhụ Jisọs

Oziọma nʼakụkụ ibe ha · Ahụhụ Jisọs

Otu onye nʼime unu ga-arara m nye

Mat 26:20–25 · Mak 14:17–21 · Luk 22:21–23 · Jọn 13:21–30

Matiu

Mat 26:20–25

20Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.

21Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”

22Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”

23Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye.

24Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”

25Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”

Mak

Mak 14:17–21

17Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa.

18Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”

19Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”

20Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere.

21Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”

Luk

Luk 22:21–23

21Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.

22Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.”

23Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.

Jọn

Jọn 13:21–30

21Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”

22Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye ọ na-ekwu maka ya.

23Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso.

24Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya.

25Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?”

26Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt.

27Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.”

28Ma ọ dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a.

29Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe.

30Mgbe ọ natachara iberibe achịcha ahụ, ọ pụrụ na-atụfughị oge, ọchịchịrị agbaala.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY