Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 21 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Maachị 2027

Sọnde · Izu Nsọ

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde Nkwụ nke Ahụhụ Onyenwe anyị

Sọnde · Agba ofufe: uhie

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma nke mbupụta

Mak 11:1–10

ma ọ bụ: Jọn 12:12–16

1Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime obodo nta dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kedoro nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-arịkwasịbeghị nʼelu ya. Tọpụnụ ya nʼagbụ, kpụtaranụ m ya. 3Ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya nʼagbụ?’ sịnụ onye ahụ, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ya ngwangwa.’ ” 4Ha ruru ma hụ otu nwa ịnyịnya e kedoro nʼakụkụ ụzọ, nʼihu otu ụlọ nke dị nʼama. Dị ka ha na-atọpụ ya, 5ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?” 6Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ. 7Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya. 8Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa. 9Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” 10“Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 50:4–7

4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 22:7–8, 16–19, 22–23

7Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. 8“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.” 16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m. 17A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị 18Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m. 19Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. 22Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. 23Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Fil 2:6–11

6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. 7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. 8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. 10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. 11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.

Oziọma

Mak 14:1–15:47

1Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya. 2Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.” 3Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi. 4Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a? 5A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike. 6Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ. 7Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya. 8O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya. 9Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.” 10Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka. 11Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha. 12Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?” 13O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya. 14Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? 15Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.” 16Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ. 17Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. 18Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!” 19Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?” 20Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere. 21Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 22Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.” 23Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ. 24Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. 25Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.” 26Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv. 27Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’ 28Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.” 29Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.” 30Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 31O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru. 32Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” 33Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. 34Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.” 35Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya. 36O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” 37Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa? 38Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.” 39Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 40Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya. 41Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 42Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.” 43Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 44Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.” 45Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 46Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike. 47Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 48Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m? 49Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.” 50Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga. 51Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya, 52ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga. 53Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ. 54Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. 55Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara. 56Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu. 57Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị, 58“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ” 59Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu. 60Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?” 61Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?” 62Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” 63Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ? 64Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” 65Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe. 66Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ. 67Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.” 68Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa. 69Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.” 70Ma ọ gọkwara agọ ọzọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.” 71Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.” 72Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa. 15:1Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet. 2Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe. 4Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.” 5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya. 6Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ. 7Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ. 8Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha. 9Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?” 10Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya. 11Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas. 12Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?” 13Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!” 14Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!” 15Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe. 16Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ. 17Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi. 18Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.” 19Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya. 20Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe. 21Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. 24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe. 25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu. 27Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 28A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. 29Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ. 30Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.” 31Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! 32Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie. 34Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 35Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!” 36Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.” 37Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume. 38Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya. 39Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.” 40O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi. 41Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem. 42Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe, 43Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs. 44Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla. 45Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya. 46Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ. 47Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike