Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 25 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 12 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Epreel 2027
Sọnde
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde Nkwụ. Mbata Onyenwe anyị na Jerusalem
Oge Lent Ukwu
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu. 2“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel. 8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. 9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya? 10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya. 11Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị. 12Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem. 15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu. 10Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa. 11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. 12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ. 13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha. 14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda. 15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
1Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha. 3Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.” 4E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. 5“Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ” 6Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. 7Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. 8Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. 9Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!” 10Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?” 11Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.” 15Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu. 16Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’?” 17Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.
Akwụkwọ ozi
4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ! 5Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. 7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs. 8Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya. 9Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
Oziọma
1Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie. 2Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ. 3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ. 4Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru, 5“Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?” 6O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego. 7Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m. 8Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.” 9Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. 10Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. 11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs. 12Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. 13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!” 14Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya, 15“Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.” 16Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a. 17Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya. 18Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Epreel na kalenda nzukọ bụ 25 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike