Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 30 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 17 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Epreel 2027
Fraịdee · Izu Nsọ
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee Ukwu na Nsọ
Oge Lent Ukwu · Obubu ọnụ siri ike
Izere nri kpamkpam
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ahụhụ nke 1
31Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya. 32Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa. 33“Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya. 34“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya. 35Ọ bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” 36Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?” Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.” 37Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị.” 38Jisọs zaghachiri, “I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 14:1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m. 2Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? 3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ. 4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.” 5Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?” 6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. 7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.” 8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.” 9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’ 10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. 11Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. 12Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m. 13Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. 14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya. 15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile. 16Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. 17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. 18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu. 19Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. 20Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu. 21Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.” 22Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?” 23Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri. 24Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m. 25“Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ. 26Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu. 27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. 28“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m. 29Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere. 30Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ. 31Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya. “Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ. 15:1“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m. 5“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. 6Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. 7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya. 8Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m. 9“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. 10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. 11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. 12Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. 13Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. 14Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. 15Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. 16Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m. 17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a. 3Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị Nna maọbụ m. 4Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ. 5Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’ 6Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. 7Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. 8Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, 9maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m; 10ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ, 11maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe. 12“Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha. 13Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa. 14Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu. 15Ihe niile Nna nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu. 16“Ọ fọdụrụ nwantakịrị oge unu agaghị ahụkwa m. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ.” 17Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka o bu nʼuche mgbe ọ na-asị, ‘Nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma mgbe nwa oge gasịkwara unu ga-ahụkwa m,’ na ‘Nʼihi na ana m alakwuru Nna’?” 18Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.” 19Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’? 20Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ. 21Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa. 22Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu. 23Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu. 24Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke. 25“Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu niile ihe banyere Nna m nʼụzọ unu ga-aghọta ya. 26Nʼụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe nʼaha m. Asịghị m unu na m ga-arịọ Nna ihe nʼihi unu. 27Nʼihi na Nna m nʼonwe ya hụrụ unu nʼanya, nʼihi na unu hụrụ m nʼanya kwerekwa na m si nʼebe Chineke nọ bịa. 28Esi m nʼebe Nna nọ pụta, bịa nʼime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna.” 29Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee, ugbu a ka okwu gị doro anya. Ọ bụkwaghị ilu ka i na-atụ. 30Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.” 31Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a? 32Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ. 33“Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.” 17:1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. 2I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. 3Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. 4Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. 5Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa. 6“Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị. 7Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa. 8Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m. 9Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị. 10Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè. 11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru. 13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha. 14Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. 15Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ. 16Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa. 17Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu. 18Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa. 19Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu. 20“Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha. 21Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m. 22Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; 23Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya. 24“Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa. 25“Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m. 26Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.” 18:1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.
Oziọma ahụhụ nke 2
1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya. 2Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge. 3Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha. 4Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?” 5Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.) 6Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala. 7Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” 8Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.” 9Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.” 10Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus. 11Ma Jisọs gwara Pita, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?” 12Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ. 13Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ. 14Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile. 15Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja. 16Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita. 17Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.” 18Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ. 19Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya. 20Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo. 21Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.” 22Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?” 23Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.” 24Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja. 25Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.” 26Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?” 27Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa. 28Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.
Oziọma ahụhụ nke 3
57Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ. 58Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie. 59Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 60Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara 61kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ. ’ ” 62Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?” 63Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?” 64Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” 65Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya? 66Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” 67Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra, 68sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?” 69Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.” 70Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.” 72Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.” 73Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.” 74Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” Mgbe ahụkwa oke ọkpa kwara akwa. 75Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.
Oziọma ahụhụ nke 4
28Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga. 29Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?” 30Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.” 31Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.” 32Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ. 33Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?” 34Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?” 35Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?” 36Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” 37Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.” 38Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya. 39Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?” 40Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu. 19:1Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe. 2Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo. 3Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu. 4Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 5Mgbe Jisọs yi okpu ogwu na uwe odo odo pụta, Pailet sịrị ha, “Lekwanụ nwoke ahụ!” 6Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 7Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.” 8Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa. 9Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla. 10Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?” 11Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.” 12Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.” 13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru). 14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ.
Oziọma ahụhụ nke 5
3Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. 4Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” 5Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. 6Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” 7Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. 8Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa. 9Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. 10Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.” 11Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 12Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla. 13Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?” 14Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu. 15Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ. 16Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. 17Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” 18Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. 19Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” 20Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. 21Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!” 22Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” 23Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” 24Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” 25Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!” 26Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe. 27Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu. 28Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. 29Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” 30Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe. 31Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe. 32Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
Oziọma ahụhụ nke 6
16Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ. 17Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi. 18Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.” 19Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya. 20Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe. 21Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. 24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe. 25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu. 27Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 28A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. 29Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ. 30Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.” 31Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! 32Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
Oziọma ahụhụ nke 7
33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. 38Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 39Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, 40na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!” 41Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị, 42“Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ” 44Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 47Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.” 48Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.” 50Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume. 51Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. 54Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
Oziọma ahụhụ nke 8
32Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya. 33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 34Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 35Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.” 36Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka, 37ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.” 38Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu. 39Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.” 40Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. 41Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” 42Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.” 43Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.” 44Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie. 45Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ. 46Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume. 47Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.” 48Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi. 49Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
Oziọma ahụhụ nke 9
25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya. 28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” 29Otu ite mmanya ọra dọrọ nso nʼebe ahụ. Ha were ogbo denye nʼime mmanya ahụ, kenye ogbo ahụ nʼosisi hisọp welie ya elu chee ya nʼọnụ. 30Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume. 31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. 36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.” 37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.”
Oziọma ahụhụ nke 10
43Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs. 44Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla. 45Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya. 46Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ. 47Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.
Oziọma ahụhụ nke 11
38Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya. 39Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ. 40Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị. 41Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla. 42Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.
Oziọma ahụhụ nke 12
62Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet. 63Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị. 64Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.” 65Pailet gwara ha sị, “Unu nwere otu ndị agha na-eche nche, kpọrọnụ ha gaa mechisie ili ahụ ike dị ka unu si maara eme.” 66Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.
Elekere nke 1
10Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara. 11Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị. 12Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ. 13Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Elekere nke 1 (Akwụkwọ ozi)
14Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ. 15Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa. 16Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke. 17Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m. 18Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
Elekere nke 1 (Oziọma)
1Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya. 2Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ. 3Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. 4Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” 5Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. 6Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” 7Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. 8Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa. 9Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. 10Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.” 11Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 12Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla. 13Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?” 14Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu. 15Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ. 16Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. 17Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” 18Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. 19Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” 20Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. 21Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!” 22Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” 23Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” 24Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” 25Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!” 26Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe. 27Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu. 28Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. 29Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” 30Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe. 31Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe. 32Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. 38Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 39Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, 40na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!” 41Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị, 42“Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ” 44Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 47Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.” 48Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.” 50Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume. 51Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. 54Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!” 55Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi. 56Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi.
Elekere nke 3
4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha. 10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya? Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị, nke na-enweghị ìhè ọbụla, tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị daberekwa na Chineke ha. 11Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ, ndị meere onwe ha ọwaọkụ, nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị, gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu. Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.
Elekere nke 3 (Akwụkwọ ozi)
6Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie. 7A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nʼihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nʼihi ezi mmadụ. 8Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị. 9Ebe a gụrụ anyị dịka ndị ezi omume site nʼọbara ya, nke karịrị nke a, a ga-esitekwa na ya zọpụta anyị site nʼọnụma Chineke. 10Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya. 11Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a.
Elekere nke 3 (Oziọma)
16Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ. 17Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi. 18Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.” 19Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya. 20Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe. 21Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. 24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe. 25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu. 27Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 28A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. 29Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ. 30Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.” 31Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! 32Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie. 34Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 35Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!” 36Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.” 37Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume. 38Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya. 39Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.” 40O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi. 41Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
Elekere nke 6
13Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ. 14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ. 15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa. 53:1Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị? 2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. 3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla. 4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. 5Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. 6Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile. 7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya. 8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya. Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu? Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ; maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe. 9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile. 12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha, nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ, a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ. 54:1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Elekere nke 6 (ihe ọgụgụ ọzọ)
9“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie, ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị. 10Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, meekwa ka unu kpụchaa isi unu. Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu. 11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị. 12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.
Elekere nke 6 (Akwụkwọ ozi)
11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.” 13Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.” 14Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. 16Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. 17Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. 18Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
Elekere nke 6 (Oziọma)
32Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya. 33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 34Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 35Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.” 36Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka, 37ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.” 38Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu. 39Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.” 40Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. 41Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” 42Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.” 43Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.” 44Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie. 45Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ. 46Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume. 47Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.” 48Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi. 49Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
Elekere nke 9
18Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ. 19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ” 20Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m. 21Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.” 22Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. 23O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị Anatot nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.” 12:1Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị, mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị. Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị: Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma? Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla? 2Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha. 3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha. 4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.” 5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan? 9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri. 10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu. 11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi. 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda. 15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.
Elekere nke 9 (Akwụkwọ ozi)
19Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs, 20bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya, 21ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke, 22ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị. 23Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi. 24Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. 25Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso. 26Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile. 27Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro. 28Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya. 29Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe? 30Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.” 31Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ.
Elekere nke 9 (Oziọma)
28Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga. 29Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?” 30Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.” 31Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.” 32Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ. 33Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?” 34Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?” 35Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?” 36Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” 37Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.” 38Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya. 39Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?” 40Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu. 19:1Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe. 2Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo. 3Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu. 4Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 5Mgbe Jisọs yi okpu ogwu na uwe odo odo pụta, Pailet sịrị ha, “Lekwanụ nwoke ahụ!” 6Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 7Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.” 8Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa. 9Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla. 10Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?” 11Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.” 12Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.” 13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru). 14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ. 17O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru). 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 19O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. 20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin. 21Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.” 22Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.” 23Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya. 24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere. 25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya. 28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” 29Otu ite mmanya ọra dọrọ nso nʼebe ahụ. Ha were ogbo denye nʼime mmanya ahụ, kenye ogbo ahụ nʼosisi hisọp welie ya elu chee ya nʼọnụ. 30Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume. 31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. 36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.” 37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
11Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ. 12Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ. 13Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.” 14Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.” 15Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ. 16Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?” 17Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.” 18Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.” 19Ma Onyenwe anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ Onyenwe anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko. 20Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.” 21Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo. 22Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara. 23Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu. 13Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ. 14Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk. 15Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere. 16Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ. 17Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
13Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ. 14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ. 15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa. 53:1Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị? 2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. 3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla. 4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. 5Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. 6Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile. 7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya. 8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya. Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu? Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ; maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe. 9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile. 12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha, nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ, a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ. 54:1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Akwụkwọ ozi (na ofufe mgbede)
18Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke. 19E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.” 20Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? 21Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere. 22Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe. 23Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. 24Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke. 25Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ. 26Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. 27Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike. 28Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. 29Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ. 30Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị. 31Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.” 2:1Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke. 2Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.
Oziọma (ihe ọgụgụ a chịkọtara)
Mat 27:1–38 · Luk 23:39–43 · Mat 27:39–54 · Jọn 19:31–37 · Mat 27:55–61
1Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya. 2Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ. 3Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. 4Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” 5Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. 6Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” 7Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. 8Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa. 9Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. 10Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.” 11Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 12Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla. 13Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?” 14Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu. 15Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ. 16Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. 17Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” 18Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. 19Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” 20Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. 21Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!” 22Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” 23Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” 24Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” 25Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!” 26Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe. 27Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu. 28Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. 29Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” 30Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe. 31Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe. 32Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. 38Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 23:39Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.” 40Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. 41Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” 42Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.” 43Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.” 27:39Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, 40na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!” 41Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị, 42“Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ” 44Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 47Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.” 48Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.” 50Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume. 51Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. 54Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!” 19:31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. 36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.” 37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.” 27:55Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi. 56Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi. 57Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef. Onye ya onwe ya bụkwa onye na-eso ụzọ Jisọs, 58jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere iwu ka e bunye ya ozu ahụ. 59Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya, 60ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa. 61Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Epreel na kalenda nzukọ bụ 30 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike