Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 26 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Maachị 2027

Fraịdee · Triduum nke Ista

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee Ọma

Triduum nke Ista · Agba ofufe: uhie

Obubu ọnụ na nchegharị

Obubu ọnụ na izere anụ

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 52:13–53:12

13Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ. 14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ. 15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa. 53:1Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị? 2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. 3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla. 4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. 5Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. 6Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile. 7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya. 8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya. Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu? Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ; maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe. 9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile. 12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha, nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ, a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 31:1, 5, 11–12, 14–16, 24

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m. 5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu. 11Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee. 12Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m. 14Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” 15Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ. 16Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ. 24Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 4:14–16; 5:7–9

14Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike. 15Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya. 16Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa. 5:7Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya. 8Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara. 9Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi.

Oziọma

Jọn 18:1–19:42

1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya. 2Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge. 3Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha. 4Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?” 5Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.) 6Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala. 7Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” 8Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.” 9Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.” 10Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus. 11Ma Jisọs gwara Pita, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?” 12Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ. 13Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ. 14Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile. 15Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja. 16Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita. 17Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.” 18Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ. 19Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya. 20Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo. 21Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.” 22Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?” 23Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.” 24Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja. 25Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.” 26Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?” 27Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa. 28Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga. 29Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?” 30Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.” 31Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.” 32Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ. 33Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?” 34Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?” 35Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?” 36Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” 37Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.” 38Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya. 39Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?” 40Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu. 19:1Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe. 2Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo. 3Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu. 4Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 5Mgbe Jisọs yi okpu ogwu na uwe odo odo pụta, Pailet sịrị ha, “Lekwanụ nwoke ahụ!” 6Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 7Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.” 8Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa. 9Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla. 10Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?” 11Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.” 12Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.” 13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru). 14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ. 17O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru). 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 19O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. 20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin. 21Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.” 22Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.” 23Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya. 24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere. 25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya. 28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” 29Otu ite mmanya ọra dọrọ nso nʼebe ahụ. Ha were ogbo denye nʼime mmanya ahụ, kenye ogbo ahụ nʼosisi hisọp welie ya elu chee ya nʼọnụ. 30Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume. 31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. 36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.” 37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.” 38Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya. 39Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ. 40Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị. 41Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla. 42Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike