Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Luk 6:38

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Luk 6:38

Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.”

Gụọ isi ahụ dum: Luk 6

N’ọnọdụ ya

35Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha.

36Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere.

37“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.

38Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.”

39Ọ tụkwaara ha ilu a, “Onye ìsì ọ pụrụ idu onye ìsì ibe ya? Ha abụọ ọ gaghị adaba nʼime olulu?

40Onye na-eso ụzọ onye ozizi anaghị akarị onye nkuzi ya, kama mgbe ọ mụtasịrị ọ ga-amata ihe dị ka onye nkuzi ya.

41“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?

Luk 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleLuke 6:38Give, and it will be given to you. A good measure, pressed down, shaken together, and running over will be poured into your lap. For with the measure you use, it will be measured back to you.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

2Kọ 9:6–8Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.
Dit 15:10Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.
Mak 4:24Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa.
Ilu 3:9–10Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
Mat 7:2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.
Ilu 22:9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
Ilu 19:17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
Ilu 10:22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike