Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Luk 12:33–34
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Luk 12:33–34
33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”
N’ọnọdụ ya
30Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa.
31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
32“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.
33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”
35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.
36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka.
37Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi.
N’asụsụ Bekee
Sell your possessions and give to the poor. Provide yourselves with purses that will not wear out, an inexhaustible treasure in heaven, where no thief approaches and no moth destroys. For where your treasure is, there your heart will be also.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.”Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa. Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha, nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa.“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha. Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe. Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike