Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 19:4–6
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 19:4–6
4Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
5Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.
6Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
N’ọnọdụ ya
1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan.
2Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ.
3Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?”
4Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
5Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.
6Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
7Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?”
8Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.
9Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”
N’asụsụ Bekee
Jesus answered, “Have you not read that from the beginning the Creator ‘made them male and female,’ and said, ‘For this reason a man will leave his father and mother and be united to his wife, and the two will become one flesh’? So they are no longer two, but one flesh. Therefore what God has joined together, let man not separate.”Ihe e hotara n’Agba Ochie
Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.”Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike