Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Mkpughe 12:9

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Mkpughe 12:9

Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.

Gụọ isi ahụ dum: Mkpughe 12

N’ọnọdụ ya

6Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).

7Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha,

8ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.

9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.

10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.

11Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.

12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”

Mkpughe 12

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRevelation 12:9And the great dragon was hurled down—that ancient serpent called the devil and Satan, the deceiver of the whole world. He was hurled to the earth, and his angels with him.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Luk 10:18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma.
Jọn 12:31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a.
Mkp 20:10Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.
1Jọn 5:19Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
Aịz 14:12Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
2Kọ 4:4Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya.
Job 2:1–2Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
Mkp 20:2–3O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ. Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike