Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Jọn 3:17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Jọn 3:17

Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya?

Gụọ isi ahụ dum: 1 Jọn 3

N’ọnọdụ ya

14Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ.

15Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.

16Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị.

17Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya?

18Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.

19Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya.

20Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile.

1 Jọn 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 John 3:17If anyone with earthly possessions sees his brother in need, but withholds his compassion from him, how can the love of God abide in him?

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Hib 13:16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
Aịz 58:7–10Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.
1Jọn 4:20Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya.
Dit 15:7–11Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara. Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya. A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.
Ilu 19:17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
Luk 3:11Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”
2Kọ 9:5–9Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye. Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.”
Jem 2:15Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị,

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike