Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jeremaya 29:11
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jeremaya 29:11
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
N’ọnọdụ ya
8Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ.
9Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
10Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.
11Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
12Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị.
13Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
14Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
N’asụsụ Bekee
For I know the plans I have for you, declares the LORD, plans to prosper you and not to harm you, to give you a future and a hope.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.Ma ha amaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị, ha aghọtakwaghị nzube ya, na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’ Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe, e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m. Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo; ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu. Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike