Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Timoti 5:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Timoti 5:8
Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.
N’ọnọdụ ya
5Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị.
6Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.
7Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta.
8Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.
9Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di.
10Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma.
11Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ.
N’asụsụ Bekee
If anyone does not provide for his own, and especially his own household, he has denied the faith and is worse than an unbeliever.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe.“Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike