Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 14:27

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 14:27

Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 14

N’ọnọdụ ya

24Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.

25“Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ.

26Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.

27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

28“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.

29Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere.

30Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ.

Jọn 14

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 14:27Peace I leave with you; My peace I give to you. I do not give to you as the world gives. Do not let your hearts be troubled; do not be afraid.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Fil 4:7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.
Jọn 16:33“Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”
Aịz 41:10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
2Te 3:16Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.
Kọl 3:15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.
2Tm 1:7Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Rom 15:13Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
Ọnụ 6:26Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.” ’

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike