Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Tesalonaịka 4:3–5

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Ndị Tesalonaịka 4:3–5

3Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko,

4ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ.

5Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Tesalonaịka 4

N’ọnọdụ ya

1Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa.

2Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.

3Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko,

4ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ.

5Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.

6Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike.

7Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ.

8Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.

1 Ndị Tesalonaịka 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Thessalonians 4:3–5For it is God’s will that you should be holy: You must abstain from sexual immorality; each of you must know how to control his own body in holiness and honor, not in lustful passion like the Gentiles who do not know God;

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 4:2Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.
Rom 12:2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
1Te 5:23Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Hib 13:4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
Kọl 3:5Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).
Efe 5:17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,
Efe 5:3–5Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ. Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele. Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.
Gal 5:19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike