Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ọrụ Ndị Ozi 20:35

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ọrụ Ndị Ozi 20:35

Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”

Gụọ isi ahụ dum: Ọrụ Ndị Ozi 20

N’ọnọdụ ya

32“Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.

33Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m.

34Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so.

35Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”

36Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere.

37Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ.

38O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.

Ọrụ Ndị Ozi 20

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleActs 20:35In everything, I showed you that by this kind of hard work we must help the weak, remembering the words of the Lord Jesus Himself: ‘It is more blessed to give than to receive.’”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Hib 13:16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
Ilu 19:17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
Luk 14:12–14Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ. Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.”
Mat 10:8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
2Kọ 8:9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.
1Te 5:14Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.
Aịz 58:7–12Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata. Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.
Rom 15:1Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike