Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 6 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Jenụwarị 2027

Wenezdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Ngosipụta Onyenwe anyị

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 60:1–6

1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. 2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 72:1–2, 7–8, 10–13

1Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa 10Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba, ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye. 11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi. 12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 3:2–3, 5–6

2Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu. 3Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu. 5Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a. 6Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma.

Oziọma

Mat 2:1–12

1Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.” 3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. 5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” 7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.” 9Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá. 12Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike