Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 19 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 6 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Jenụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 34 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Holy Theophany: the Baptism of Our Lord, God, and Saviour Jesus Christ

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Mak 1:9–11

9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”

Akwụkwọ ozi (maka Teofani)

Taị 2:11–14; 3:4–7

11Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè. 12Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. 13Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst. 14Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile. 3:4Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe, 5ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ, 6onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst, 7ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi.

Oziọma (maka Teofani)

Mat 3:13–17

13Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim. 14Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?” 15Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere. 16Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. 17Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”

Ngọzi Ukwu nke Mmiri

Aịz 35:1–10

1Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ; okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara. Dịka rozu, 2ọ ga-agbawa ifuru jupụta; ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ. A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn, nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel. Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ, ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu nke Chineke anyị. 3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume. 4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ. Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya. E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ. Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

Ngọzi Ukwu nke Mmiri

Aịz 55:1–13

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. 12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ. 13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya; ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya. Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu, nke ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”

Ngọzi Ukwu nke Mmiri

Aịz 12:3–6

3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Ngọzi Ukwu nke Mmiri (Akwụkwọ ozi)

1Kọ 10:1–4

1Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee. 2Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis. 3Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ. 4Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.

Ngọzi Ukwu nke Mmiri (Oziọma)

Mak 1:9–11

9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 19 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike