Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 5:33

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 5:33

Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 5

N’ọnọdụ ya

30Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya.

31“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”

32Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya.

33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

Ndị Efesọs 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 5:33Nevertheless, each one of you also must love his wife as he loves himself, and the wife must respect her husband.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 3:2–7mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ. Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke. Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha. Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu. Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
Est 1:20Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”
Efe 5:22Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị.
Efe 5:25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike