Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Umengwụ
Ndụ na ọrụ
Ihe Baịbụl kwuru banyere Umengwụ
Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (15), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.
Ilu 10:4
Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.2Te 3:10
Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”Ilu 6:9
Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?Ilu 13:4
Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.Kọl 3:23
Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.Ilu 20:4
Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.Ilu 6:6
Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.Ilu 21:25
Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.Ilu 18:9
Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.Ilu 20:13
Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.Ilu 12:24
Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.Ilu 14:23
Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa.2Te 3:11–12
Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla. Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.Ilu 22:13
Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”Ilu 19:15
Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.
Isi mmalite
Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.