Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 28 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 15 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Epreel 2027
Wenezdee · Izu Nsọ
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee Ukwu na Nsọ
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma (Ofufe ụtụtụ nke Onye na-alụ nwunye)
17Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya. 18Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ. 19Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.” 20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. 21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” 22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs. 23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. 24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. 26Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ. 27“Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a. 28Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.” 29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.” 30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu. 31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. 32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.” 33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ. 34Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” 35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga. 36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya. 37Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. 38Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?” 39Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị, 40“O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.” 41Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya. 42Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere. 43Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke. 44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m. 45Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m. 46Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị. 47“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe. 48Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ. 49Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya. 50Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”
Elekere nke 6
3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị Izrel, ndị bụ mba na-enupu isi, ndị nupuru isi megide m. Ha na nna nna ha enupula isi megide m, ruo ọ bụladị nʼụbọchị taa. 4Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu.’ 5Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha. 6Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, ọ bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, ọ bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. 7Ị ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. 8Ma gị, nwa nke mmadụ, gee ntị nʼihe m na-agwa gị. Enupula isi dịka ha si nupu isi. Meghee ọnụ gị taa ihe m ga-etinye gị nʼọnụ.” 9Otu mgbe ahụ, elere m anya hụ aka e setịpụrụ, nke ji akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ, 10nke e dekwara ihe nʼime ya, ihu na azụ ya. Aka ahụ ji ya gbasapụrụ ya mee ka m hụ ihe e dere nʼime ya. Ọ bụ okwu ịkwa akwa na iru ụjụ na ahụhụ. 3:1Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.” 2Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie. 3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
11Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya. 12Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja. 13Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?” 14Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.” 15Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri. 16Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri. 17Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri. 18Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?” 19Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.” 20Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.” 21Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. 22Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya. 2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.” 3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.” 4Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya. 5Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.” 6Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.” 7Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya. 8Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ. 9Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.” 10Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.
Oziọma (Liturgi nke onyinye e doro nsọ tupu oge)
6Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, 7otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri. 8Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a! 9A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.” 10Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma. 11Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile. 12Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili. 13Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.” 14Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. 15Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. 16Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Epreel na kalenda nzukọ bụ 28 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike