Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 29 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 16 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Epreel 2027

Tọọzdee · Izu Nsọ

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee Ukwu na Nsọ

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma (Ofufe ụtụtụ nke Onye na-alụ nwunye)

Luk 22:1–39

1Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso. 2Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ. 3Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya. 4Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha. 5Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego. 6O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ. 7O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja. 8O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.” 9Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?” 10Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere. 11Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’ 12Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.” 13Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ. 14Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe. 15Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ. 16Nʼihi na asị m unu, agaghị m erikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe a ga-emezu ya nʼalaeze Chineke.” 17O buru iko, mgbe o nyechara ekele ọ sịrị, “Burunu nke a kesaa nʼetiti unu. 18Nʼihi na asị m unu, site ugbu a ga nʼihu, agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.” 19O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.” 20Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu. 21Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri. 22Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.” 23Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a. 24Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya. 25Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ. 26Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi. 27Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu. 28Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile. 29Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya. 30Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. 31“Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti. 32Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.” 33Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.” 34Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.” 35Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?” Ha sịrị, “O nweghị ihe kọrọ anyị.” 36Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu. 37Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.” 38Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.” 39Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.

Elekere nke 1

Jer 11:18–12:5, 9–11, 14–15

18Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ. 19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ” 20Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m. 21Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.” 22Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. 23O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị Anatot nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.” 12:1Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị, mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị. Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị: Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma? Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla? 2Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha. 3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha. 4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.” 5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan? 9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri. 10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu. 11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi. 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda. 15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 19:10–19

10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri, 11jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile. 12Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’ 13Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.” 14Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha. 15Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.” 16Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji. 17Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ. 18Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ. 19Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Job 38:1–23; 42:1–5

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: 2“Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè? 3Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha. 4“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara. 5Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya? 6Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya? 7Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike? 8“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta, 9mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike, 10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya, 11mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’? 12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya, 13ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu? 14Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe. 15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri. 16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri? 17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ? 18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile. 19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi? 20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha? 21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ. 22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe, 23nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha? 42:1Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị: 2“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. 3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. 4“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ 5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 50:4–11

4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha. 10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya? Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị, nke na-enweghị ìhè ọbụla, tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị daberekwa na Chineke ha. 11Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ, ndị meere onwe ha ọwaọkụ, nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị, gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu. Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.

Akwụkwọ ozi

1Kọ 11:23–32

23Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha. 24Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.” 25Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.” 26Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ. 27Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị. 28Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ. 29Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst. 30Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ. 31Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe. 32Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe.

Oziọma (ihe ọgụgụ a chịkọtara)

Mat 26:1–20 · Jọn 13:3–17 · Mat 26:21–39 · Luk 22:43–45 · Mat 26:40–27:2

1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, 2“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.” 3Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas. 4Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya. 5Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.” 6Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, 7otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri. 8Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a! 9A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.” 10Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma. 11Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile. 12Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili. 13Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.” 14Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. 15Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. 16Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha. 17Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?” 18Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ” 19Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ. 20Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. 13:3Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha. 6Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?” 7Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.” 8Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.” 9Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.” 10Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.” 11Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.” 12Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu? 13Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. 16Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. 17Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha. 26:21Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” 22Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?” 23Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. 24Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 25Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.” 26Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.” 27Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. 28Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie. 29Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.” 30Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv. 31Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’ 32Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.” 33Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.” 34Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 35Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru. 36Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.” 37Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. 38Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.” 39Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” 22:43Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume. 44Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara. 45Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi. 26:40Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? 41Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” 42Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” 43Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. 44Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 45Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 46Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!” 47Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 48Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” 49Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 50Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike. 51Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 52Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma. 53I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya? 54Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?” 55Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m. 56Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga. 57Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ. 58Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie. 59Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 60Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara 61kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ. ’ ” 62Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?” 63Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?” 64Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” 65Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya? 66Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” 67Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra, 68sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?” 69Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.” 70Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.” 72Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.” 73Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.” 74Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” Mgbe ahụkwa oke ọkpa kwara akwa. 75Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu. 27:1Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya. 2Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ.

Oziọma (na ịsa ụkwụ)

Jọn 13:1–11

1Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ. 2Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye. 3Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha. 6Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?” 7Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.” 8Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.” 9Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.” 10Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.” 11Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”

Oziọma (mgbe ịsa ụkwụ gasịrị)

Jọn 13:12–17

12Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu? 13Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. 16Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. 17Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Epreel na kalenda nzukọ bụ 29 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike