Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 27 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 14 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Epreel 2027

Tiuzdee · Izu Nsọ

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee Ukwu na Nsọ

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma (Ofufe ụtụtụ nke Onye na-alụ nwunye)

Mat 22:15–23:39

15Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya. 16Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ. 17Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 18Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? 19Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. 20Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?” 21Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.” 22Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ. 23Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ. 24Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa. 25Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya. 26Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa. 27Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 28Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?” 29Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. 30Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 31Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị, 32Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.” 33Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya. 34Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe. 35Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya: 36“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?” 37Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ 38Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile. 39Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ 40Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.” 41Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha, 42“Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.” 43Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị, 44“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’ 45Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?” 46Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ. 23:1Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị, 2“Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis. 3Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. 4Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha. 5“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu. 6Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya. 7Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’ 8“Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu. 9Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe. 10Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst. 11Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 12Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.” 13“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata. 14“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu. 15“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu. 16“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ. 17Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ? 18Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’ 19Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ? 20Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ. 21Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi. 22Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nʼelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi. 23“E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya. 24Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel. 25“Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile. 26Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha. 27“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha. 28Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume. 29“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume. 30Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma. 31Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma. 32Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere. 33“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? 34Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ. 35Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu. 36Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a. 37“O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a! 38Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 39Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. ”

Elekere nke 6

Izk 1:21–28

21Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. 22A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal. 23Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya. 24Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha. 25Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa. 26Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ. 27Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu. 28Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube Onyenwe anyị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 2:5–10

5Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. 6Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.” 7Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?” 8Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. 9Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. 10Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Job 1:13–22

13Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye. 14Otu onye nʼime ndị na-eje ozi bịakwutere Job sị, “Mgbe ehi anyị na-akọ ọrụ na mgbe ịnyịnya ibu anyị na-ata nri nʼebe dị nso, 15ndị Sheba bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.” 16Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 17Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 18Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ, 19na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, 21kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.” 22Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.

Oziọma (Liturgi nke onyinye e doro nsọ tupu oge)

Mat 24:36–26:2

36“Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya. 37Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa. 38Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya. 39Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị. 40Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ. 41Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ. 42“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. 43Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya. 44Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya. 45“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? 46Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. 47Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere. 48Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ 49ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. 50Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. 51Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze. 25:1“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. 2Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. 3Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. 4Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. 5Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra. 6“Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ 7“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. 8Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ 9“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ 10“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. 11“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ 12“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’ 13“Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ. 14“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. 15O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. 16Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. 17Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. 18Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. 19“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. 20Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ 21“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 22“Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ 23“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 24“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. 25Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ 26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. 27Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. 28“ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. 29Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. 30Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ 31“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. 32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. 33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya. 34“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. 35Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. 36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ 37“Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? 38Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? 39Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ 40“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’ 41“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. 42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. 43Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ 44“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ 45“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ 46“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” 26:1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, 2“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Epreel na kalenda nzukọ bụ 27 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike