Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 28 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Epreel 2027

Wenezdee · Izu nke 5 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 5 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Louis Grignion de Montfort, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Pita Chanel, Onye ụkọchukwu na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 15:1–6

1Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.” 2Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a. 3Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu. 4Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee. 5Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.” 6Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 122:1–2, 4–5

1Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. 4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. 5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

Oziọma

Jọn 15:1–8

1“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m. 5“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. 6Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. 7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya. 8Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike