Bible Explorer

Baịbụl › Izikiel › 2

IGCB · Isi 2 / 48

Izikiel 2

1Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na ana m aga ịgwa gị okwu.”

2Mmụọ ahụ banyere nʼime m mgbe ahụ ọ na-ekwu okwu, mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Anụrụ m ka ọ gwara m okwu.

3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị Izrel, ndị bụ mba na-enupu isi, ndị nupuru isi megide m. Ha na nna nna ha enupula isi megide m, ruo ọ bụladị nʼụbọchị taa.

4Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu.’

5Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha.

6Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, ọ bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, ọ bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.

7Ị ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.

8Ma gị, nwa nke mmadụ, gee ntị nʼihe m na-agwa gị. Enupula isi dịka ha si nupu isi. Meghee ọnụ gị taa ihe m ga-etinye gị nʼọnụ.”

9Otu mgbe ahụ, elere m anya hụ aka e setịpụrụ, nke ji akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ,

10nke e dekwara ihe nʼime ya, ihu na azụ ya. Aka ahụ ji ya gbasapụrụ ya mee ka m hụ ihe e dere nʼime ya. Ọ bụ okwu ịkwa akwa na iru ụjụ na ahụhụ.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org