Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 26 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 13 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Epreel 2027

Mọnde · Izu Nsọ

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde Ukwu na Nsọ

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma (Ofufe ụtụtụ nke Onye na-alụ nwunye)

Mat 21:18–43

18Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 19Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. 20Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?” 21Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa. 22Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.” 23Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?” 24Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile. 25Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 26Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” 27Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a. 28“Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’ 29“Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ. 30“Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị. 31“Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke. 32Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya. 33“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. 35“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ 38“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. 40“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” 41Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” 42Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’ 43“Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ.

Elekere nke 6

Izk 1:1–20

1O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke. 2Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ, 3okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa. Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ. 4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. 5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ. 6Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ. 7Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma. 8Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị. 9Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga. 10Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo. 11Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha. 12Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ. 13Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta. 14Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu. 15Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya. 16Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu. 17Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga. 18Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. 19Mgbe ihe ndị a dị ndụ fepụrụ gaa nʼihu, ụkwụ ụgbọala ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ndị ahụ na-esokwa. 20Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 1:1–20

1Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ndị sooro Jekọb gaa biri nʼala Ijipt, onye ọbụla nʼime ha kpọ ezinaụlọ ya. 2Ruben, Simiọn, Livayị na Juda; 3Isaka, Zebụlọn na Benjamin; 4Dan, na Naftalị; Gad na Asha. 5Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt. 6Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara. 7Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile. 8Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt, 9ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị. 10Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.” 11Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe. 12Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu. 13Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu, 14mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu. 15Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị, 16“Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.” 17Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ. 18Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?” 19Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.” 20Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Job 1:1–12

1Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz. Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ. 2Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ. 3O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ. 4Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa. 5Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile. 6Otu ụbọchị ụmụ Chineke bịara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị ma ekwensu sonyekwara ha bịa. 7Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara Onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.” 8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ nọ nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla.” 9Ekwensu zara Onyenwe anyị sị, “Job ọ na-atụ Chineke egwu nʼefu? 10Ọ bụ na ị gbaghị Job na ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu nʼakụkụ niile? I gọziela ọrụ aka ya, nke mere na igwe ewu na atụrụ ya na igwe ehi ya jupụtara ebe niile. 11Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.” 12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.” Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ.

Oziọma (Liturgi nke onyinye e doro nsọ tupu oge)

Mat 24:3–35

3Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” 4Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. 5Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 6Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. 7Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. 8Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa. 9“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 10Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị. 11Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. 12Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi. 13Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 14A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa. 15“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara). 16Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu. 17Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya. 18Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya. 19Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ 20Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike. 21Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. 22“Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ. 23Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 24Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara. 25Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị. 26“Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela. 27Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. 28Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta. 29“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’ 30“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. 31Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa. 32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. 33Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu. 34Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga. 35Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Epreel na kalenda nzukọ bụ 26 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike