Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 26 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Epreel 2027
Mọnde · Izu nke 5 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 5 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume. 6Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ. 7Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ. 8Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla. 9O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya, 10were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije. 11Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.” 12Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu. 13Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha. 14Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu, 15na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha. 16Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha. 17Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.” 18Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
Abụ Ọma nzaghachi
1Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị. 2Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” 3Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme. 4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ. 15Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu. 16Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
Oziọma
21Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.” 22Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?” 23Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri. 24Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m. 25“Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ. 26Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike