Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 20 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Maachị 2027
Satọdee · Izu nke 5 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 5 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
21ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha. 22Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ. 23Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 24“ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile. 25Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi. 26Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. 27Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m. 28Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-edo Izrel nsọ.’ ”
Abụ Ọma nzaghachi
10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. 13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
Oziọma
45Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya. 46Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere. 47Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama. 48Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.” 49Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla. 50Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.” 51Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu. 52Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile. 53Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya. 54Ya mere, Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe ndị Juu ga-ahụ ya. O siri nʼebe ahụ pụọ gaa nʼakụkụ ọzara nʼotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ nʼebe ahụ. 55Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha. 56Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?” 57Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike