Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 22 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Maachị 2027
Mọnde · Izu Nsọ
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke Izu Nsọ
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 2Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa, maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi. 3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi. 4Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.” 5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ. 6“Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m. Aga m echebe gị, gbaa gị ume, nʼihi na eweere m gị nye ndị m ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike. Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile. 7Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. 3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
Oziọma
1Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie. 2Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ. 3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ. 4Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru, 5“Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?” 6O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego. 7Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m. 8Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.” 9Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. 10Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. 11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike