Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 7 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Febrụwarị 2027
Sọnde · Izu nke 5 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 5 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ? 2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya, 3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya. 4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ. 6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla. 7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya! 2Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ. 3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ. 4Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu. 5Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ. 6Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
16Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma. 17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka. 18Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ. 19Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst. 22Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ. 23Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.
Oziọma
29Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru. 30Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya. 31Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa. 32Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. 33Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. 34Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ. 35Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. 36Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya. 37Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!” 38Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.” 39Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike