Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 8 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Febrụwarị 2027
Mọnde · Izu nke 5 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 5 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Jerom Emiliani, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Josefin Bakhita, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ. 14Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche. 15Ka ha bụrụ ìhè na mbara eluigwe inye ìhè nʼelu ụwa.” O si otu a dịrị. 16Chineke mere ìhè ukwu abụọ, nke kacha ịdị ukwu ka ọ bụrụ nke ga-achị ehihie, ma nke dị nta ka ọ bụrụ nke ga-achị abalị. O mekwara kpakpando dị iche iche. 17Chineke debere ha na mbara eluigwe inye ìhè nʼụwa, 18ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 19Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ.
Abụ Ọma nzaghachi
Abụ 104:1–2, 5–6, 10–12, 24, 35
1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. 2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu 5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya. 6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile. 10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe. 11Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ. 12Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ. 24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. 35Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!
Oziọma
53Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha. 54Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ. 55Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ. 56Ebe ọbụla ọ bara, nʼobodo ukwu maọbụ na obodo nta, maọbụ nʼubi, ndị mmadụ na-ebute ndị ọrịa nibe ha nʼahịa. Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ ọ bụladị ọnụnụ uwe ya aka; ndị niile metụrụ ya aka nwetara ọgwụgwọ.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jerom Emiliani, Onye ụkọchukwu
- Onye nsọ Josefin Bakhita, Nwaagbọghọ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike