Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 7 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 25 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Febrụwarị 2027

Sọnde · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 36 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Ndị ọhụrụ nwụrụ nʼihi okwukwe na ndị kwupụtara okwukwe nke Rọshịa

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 10; Ilu 3; Ilu 8 (amaokwu a họọrọ)

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 10 (amaokwu a họọrọ)

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 3

Mak 16:9–20

9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. 10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ. 11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị. 12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo. 13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị. 14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite. 15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.” 19Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke. 20Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.

Akwụkwọ ozi

1Tm 1:15–17

15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. 16Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. 17Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Gregori)

1Kọ 12:7–11

7Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. 8Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ. 9Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. 10Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. 11Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.

Oziọma

Luk 18:35–43

35O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. 36Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme. 37Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.” 38O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!” 39Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 40Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya, 41“Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.” 42Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.” 43Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.

Oziọma (maka Onye nsọ Gregori)

Jọn 10:9–16

9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. 10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke. 11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya. 12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha. 13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ. 14“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. 15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. 16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 7 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike