Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 6 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Febrụwarị 2027

Satọdee · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Pọl Miki na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 13:15–17, 20–21

15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya. 16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ. 17Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru. 20Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, 21mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 23:1–6

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

Oziọma

Mak 6:30–34

30Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri. 31Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.” 32Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha. 33Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo. 34Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike