Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 16 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Mee 2027
Sọnde · Izu nke 7 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde Pentikọọsụ
Mmemme ukwu · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe. 2Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. 3Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. 4Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike. 5Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe. 6Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche. 7Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili? 8Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche? 9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa, 10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa 11(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. 24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa. 31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ, 34Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
16Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ. 17Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime. 18Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu. 19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko. 20Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu. 21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke. 22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
Oziọma
26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:12“Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha. 13Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa. 14Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu. 15Ihe niile Nna nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike